1Onyenwe anyị siri m, “Were otu mbadamba ihe dị ukwuu, were odee nke onye ọbụla na-eji ede ihe dekwasị ya Maha-shalal-Hash-Baz.
2Aga m akpọbata Ụraya onye nchụaja na Zekaraya nwa Jeberekaya dịka ndị akaebe kwesiri ntụkwasị obi.”
3Emesịa, mụ na nwunye m, bụ onye amụma dinakọrọ, ọ tụụrụ ime, mụọrọ m nwa nwoke. Ma Onyenwe anyị sịrị m, “Gụọ ya Maha-shalal-Hash-Baz.
4Nʼihi na tupu nwantakịrị ahụ etolite ịkpọ nne maọbụ nna, eze ndị Asịrịa ga-ebuso Damaskọs na Sameria agha, bukọrọkwa akụ ha niile.”