14Nʼihi ya, nʼotu ụbọchị, Onyenwe anyị ga-ebibi ndịisi Izrel na ndị ọdụdụ, ọ ga-ebibikwa alaka nkwụ na osisi achara niile.
15Ndị okenye na ndị a maara aha ha bụ ndịisi ha, ndị amụma ụgha bụ ọdụdụ ha.
16Nʼihi na ndị ndu nke ndị ya eduhiela ha; ndị na-ezi ha ụzọ emeela ka ha kpafuo.
17Ya mere, Onyenwe anyị agaghị enwe mmasị nʼụmụ okorobịa ahụ, ọ gaghị enwekwa obi ebere nʼebe ụmụ ndị na-enweghị nna maọbụ nʼebe ụmụ nwanyị na-enweghị dị nọ, nʼihi na onye ọbụla nʼime ha adịghị asọpụrụ Chineke, bụrụkwa ndị ajọ omume, ọnụ onye ọbụla na-ekwu ihe nzuzu. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ.
18Nʼezie, ajọ omume na-ere dị ka ọkụ: ọ na-erepịa ogwu na uke, ọ na-emekwa ka oke ọhịa nwuru ọkụ, mee ka anwụrụ ọkụ si na ya rigoruo na mbara eluigwe.