12Ndị Aram sitere nʼọwụwa anyanwụ, na ndị Filistia sitere nʼọdịda anyanwụ ha e werela ọnụ ghere oghe richapụ Izrel. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ.
13Ma ọ bụ ezie na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ataala ha ahụhụ dị otu a, ndị Izrel echegharibeghị, ha alọghachikwutebeghị ya.
14Nʼihi ya, nʼotu ụbọchị, Onyenwe anyị ga-ebibi ndịisi Izrel na ndị ọdụdụ, ọ ga-ebibikwa alaka nkwụ na osisi achara niile.
15Ndị okenye na ndị a maara aha ha bụ ndịisi ha, ndị amụma ụgha bụ ọdụdụ ha.
16Nʼihi na ndị ndu nke ndị ya eduhiela ha; ndị na-ezi ha ụzọ emeela ka ha kpafuo.