10“Nkume brik ndị ahụ adakpọsịala ma anyị ga-eji nkume a waziri awazi wughachi ha; ọ bụ ezie na e gbutusịala osisi sikamọ niile anyị ji wuo ụlọ anyị, ma anyị ga-eji osisi ọma sida dochie ha.”
11Ma Onyenwe anyị a kpaliela ndị iro Rezin ka ha bilie megide ha, ọ kwaliekwala ndị iro ha.
12Ndị Aram sitere nʼọwụwa anyanwụ, na ndị Filistia sitere nʼọdịda anyanwụ ha e werela ọnụ ghere oghe richapụ Izrel. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ.
13Ma ọ bụ ezie na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ataala ha ahụhụ dị otu a, ndị Izrel echegharibeghị, ha alọghachikwutebeghị ya.
14Nʼihi ya, nʼotu ụbọchị, Onyenwe anyị ga-ebibi ndịisi Izrel na ndị ọdụdụ, ọ ga-ebibikwa alaka nkwụ na osisi achara niile.