Jemis 1

Nʼihi na mgbe a na-anwa okwukwe unu ọnwụnwa, ntachiobi unu na-enwe ohere ito eto.

James 1:3 (UKJV) Knowing this, that the trying of your faith works patience.

1Jemis, nwaodibo Chineke na nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, Na-edegara agbụrụ iri na abụọ ndị gbasara nʼelu ụwa niile akwụkwọ ozi a: Ndeewonụ!

2Ụmụnna m, ka obi unu jupụta nʼọṅụ mgbe ọbụla ọnwụnwa dị iche iche gbara unu gburugburu.

3Nʼihi na mgbe a na-anwa okwukwe unu ọnwụnwa, ntachiobi unu na-enwe ohere ito eto.

4Ka nguzosike unu pụta ìhè, ka unu zuo oke ma nwezuokwa ihe niile, na-adịghị ihe ọbụla nke ga-akọ unu.

5Ọ bụrụ na ọ dị onye na-enweghị amamihe, ya rịọ Chineke, onye na-enye onye ọbụla rịọrọ ya amamihe nʼafọ ofufu na-ataghịkwa onye ọbụla ụta, a ga-ewerekwa ya nye ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.