Jemis 3

Ọ bụ ihe pụrụ ime na mmiri dị mma ịṅụ aṅụ na mmiri nnu ga-esite nʼotu isi iyi ahụ na-asọpụta?

James 3:11 (UKJV) Does a fountain send forth at the same place sweet water and bitter?

9Ọ bụ ya ka anyị ji eto Onyenwe anyị na Nna anyị. Ọ bụkwa ya ka anyị ji abụ mmadụ ibe anyị ọnụ, bụ ndị Chineke mere nʼoyiyi nke ya.

10Site nʼotu ọnụ anyị ka ịja mma na ịbụ ọnụ na-esi apụta. Ụmụnna m, nke a abụghị ihe ziri ezi.

11Ọ bụ ihe pụrụ ime na mmiri dị mma ịṅụ aṅụ na mmiri nnu ga-esite nʼotu isi iyi ahụ na-asọpụta?

12Ụmụnna m, osisi fiig ọ pụrụ ịmị oliv, ka osisi grepu ọ pụrụ ịmịpụta fiig? Nʼụzọ dị otu a, anyị makwaara na mmiri nnu apụghịkwa ịsọpụta mmiri dị mma ọṅụṅụ.

13Ọ dị onye ọbụla nʼime unu na-agụ onwe ya dị ka onye maara ihe na onye nwere nghọta? Ya gosi amamihe ya na nghọta ya site nʼibi ezi ndụ na ịrụ ọrụ ọma site nʼobi dị umeala.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.