Jemis 3

Site nʼotu ọnụ anyị ka ịja mma na ịbụ ọnụ na-esi apụta. Ụmụnna m, nke a abụghị ihe ziri ezi.

James 3:10 (UKJV) Out of the same mouth proceeds blessing and cursing. My brethren, these things ought not so to be.

8ma mmadụ ọbụla adịghị nke nwere ike ịzụ ire. Ọ bụ ihe dị oke njọ na-adịghị ekwe nchịkọta, ma jupụtakwa na nsi na-ebute ọnwụ.

9Ọ bụ ya ka anyị ji eto Onyenwe anyị na Nna anyị. Ọ bụkwa ya ka anyị ji abụ mmadụ ibe anyị ọnụ, bụ ndị Chineke mere nʼoyiyi nke ya.

10Site nʼotu ọnụ anyị ka ịja mma na ịbụ ọnụ na-esi apụta. Ụmụnna m, nke a abụghị ihe ziri ezi.

11Ọ bụ ihe pụrụ ime na mmiri dị mma ịṅụ aṅụ na mmiri nnu ga-esite nʼotu isi iyi ahụ na-asọpụta?

12Ụmụnna m, osisi fiig ọ pụrụ ịmị oliv, ka osisi grepu ọ pụrụ ịmịpụta fiig? Nʼụzọ dị otu a, anyị makwaara na mmiri nnu apụghịkwa ịsọpụta mmiri dị mma ọṅụṅụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.