1Ụmụnna m, ka ọtụtụ nʼime unu hapụ ịgbalị ịbụ ndị ozizi, nʼihi na unu maara na anyị bụ ndị ozizi ka a ga-ekpe ikpe nʼọnọdụ sikarịrị ike.
2Nʼihi na anyị niile na-asọ ngọngọ site nʼọtụtụ ụzọ. Ma onye ọbụla nke na-adịghị emehie site nʼikwuhie ọnụ bụ onye tozuru oke na onye pụrụ ijide anụ ahụ ya niile aka.
3Ọ bụrụ na anyị e tinye mkpụmkpụ igwe e ji ekechi ọnụ ịnyịnya ibu nʼọnụ ya, ka o rubere anyị isi, anyị na-eduru ya gaa ebe anyị chọrọ.
4Otu a kwa, ọ bụladị ụgbọ mmiri buru ibu nke ikuku dị ike na-ebugharị nʼosimiri, ka onye na-anya ụgbọ mmiri pụrụ ime ka ọ gaa ebe ọ chọrọ site nʼịtụgharịa ụmara ntakịrị e ji anya ụgbọ.