Jemis 4

Unu na-arịọ ma unu adịghị anata, nʼihi na unu na-arịọ nʼebumnobi ọjọọ. Unu na-arịọ ka unu mefuo ya nʼihe ụtọ nke ụwa.

James 4:3 (UKJV) All of you ask, and receive not, because all of you ask amiss, that all of you may consume it upon your lusts.

1Gịnị bụ ihe na-ebute ọgụ na esemokwu nʼetiti unu. Ebee ka ha siri bịa? Ọ bụghị ọchịchọ ọjọọ unu nwere nʼime onwe unu?

2Ọ bụrụ na unu chọọ ma unu achọtaghị ya, unu egbuo mmadụ. Unu na-enwe anya ukwu nʼihe onye ọzọ nwere ma ọ bụrụ na unu enwetaghị ya, unu amalite ịlụ ọgụ na ibu agha. Unu enweghị maka unu chọrọ arịọghị ya nʼekpere.

3Unu na-arịọ ma unu adịghị anata, nʼihi na unu na-arịọ nʼebumnobi ọjọọ. Unu na-arịọ ka unu mefuo ya nʼihe ụtọ nke ụwa.

4Ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi! Ọ bụ na unu amaghị na unu na ụwa bụrụ enyi, unu ga-esi otu a bụrụ ndị iro Chineke? Onye ọbụla nke chọrọ ịbụ enyi nke ụwa, na-eme onwe ya onye iro nke Chineke.

5Unu chere na ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ na-ekwu nʼefu mgbe ọ na-asị, “Chineke na-ekwosi ekworo ike nʼihi Mmụọ Nsọ ya nke o mere ka o biri nʼime anyị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.