3Unu na-arịọ ma unu adịghị anata, nʼihi na unu na-arịọ nʼebumnobi ọjọọ. Unu na-arịọ ka unu mefuo ya nʼihe ụtọ nke ụwa.
4Ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi! Ọ bụ na unu amaghị na unu na ụwa bụrụ enyi, unu ga-esi otu a bụrụ ndị iro Chineke? Onye ọbụla nke chọrọ ịbụ enyi nke ụwa, na-eme onwe ya onye iro nke Chineke.
5Unu chere na ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ na-ekwu nʼefu mgbe ọ na-asị, “Chineke na-ekwosi ekworo ike nʼihi Mmụọ Nsọ ya nke o mere ka o biri nʼime anyị.”
6Ma ọ na-enye anyị amara karịa. Ya mere, Akwụkwọ nsọ ji sị, “Chineke na-eguzo imegide ndị na-ebuli onwe ha elu, ma ọ na-enye ndị dị umeala nʼobi amara.”
7Ya mere, nyenụ Chineke onwe unu. Guzonụ megide ekwensu, ọ ga-esi nʼebe unu nọ gbapụ.