Jemis 5

Ekpere nke okwukwe ga-azọpụta onye ọrịa ahụ. Onyenwe anyị ga-ekulite ya, ọ bụrụkwa na o mehiere, a ga-agbaghara ya.

James 5:15 (UKJV) And the prayer of faith shall save the sick, and the Lord shall raise him up; and if he have committed sins, they shall be forgiven him.

13Ọ dị onye ọbụla nʼetiti unu nọ na nsogbu? Ka onye dị otu ahụ kpee ekpere. Ọ dị onye na-aṅụrị ọṅụ? Ya bụọ abụ otuto.

14Ọ dị onye nọ nʼetiti unu ahụ na-esighị ike? Ya kpọọ ndị okenye chọọchị ka ha kpeere ya ekpere, ka ha wụkwasịkwa ya mmanụ otite nʼisi kpọkuokwa aha Onyenwe anyị.

15Ekpere nke okwukwe ga-azọpụta onye ọrịa ahụ. Onyenwe anyị ga-ekulite ya, ọ bụrụkwa na o mehiere, a ga-agbaghara ya.

16Ya mere kwupụtaranụ ibe unu mmehie unu. Kpeekwaranụ ibe unu ekpere ka e nwe ike gwọọ unu. Ekpere onye ezi omume dị ike dịkwa ire.

17Ịlaịja bụ mmadụ dị ka anyị, ma o kpere ekpere rịọ ka mmiri hapụ izo, mmiri ezokwaghị nʼala ahụ ruo afọ atọ na ọnwa isii.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.