Jemis 5

Ọ dị onye nọ nʼetiti unu ahụ na-esighị ike? Ya kpọọ ndị okenye chọọchị ka ha kpeere ya ekpere, ka ha wụkwasịkwa ya mmanụ otite nʼisi kpọkuokwa aha Onyenwe anyị.

James 5:14 (UKJV) Is any sick among you? let him call for the elders of the church; and let them pray over him, anointing him with oil in the name of the Lord:

12Karịsịa ụmụnna m, unu aṅụla iyi. Unu aṅụkwala iyi mgbe ọbụla, ọ bụladị iji eluigwe maọbụ ụwa, maọbụ ihe ọbụla ọzọ ṅụọ iyi. Kama ka “E” unu bụrụ “E.” Ka “E e,” unu bụrụkwa “E e.” Ka unu hapụ isite nʼụzọ dị otu a mehie ma wetakwara onwe unu ikpe ọmụma.

13Ọ dị onye ọbụla nʼetiti unu nọ na nsogbu? Ka onye dị otu ahụ kpee ekpere. Ọ dị onye na-aṅụrị ọṅụ? Ya bụọ abụ otuto.

14Ọ dị onye nọ nʼetiti unu ahụ na-esighị ike? Ya kpọọ ndị okenye chọọchị ka ha kpeere ya ekpere, ka ha wụkwasịkwa ya mmanụ otite nʼisi kpọkuokwa aha Onyenwe anyị.

15Ekpere nke okwukwe ga-azọpụta onye ọrịa ahụ. Onyenwe anyị ga-ekulite ya, ọ bụrụkwa na o mehiere, a ga-agbaghara ya.

16Ya mere kwupụtaranụ ibe unu mmehie unu. Kpeekwaranụ ibe unu ekpere ka e nwe ike gwọọ unu. Ekpere onye ezi omume dị ike dịkwa ire.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.