Jemis 5

Akụnụba unu ebidola ịta nchara, mkpu eripịakwala uwe unu.

James 5:2 (UKJV) Your riches are corrupted, and your garments are moth-eaten.

1Ugbu a geenụ ntị unu ndị ọgaranya, oge eruola mgbe unu kwesiri ịkwa akwa na ịsụ ude nʼihi nsogbu na-akwado ịbịakwasị unu.

2Akụnụba unu ebidola ịta nchara, mkpu eripịakwala uwe unu.

3Ọlaọcha na ọlaedo unu agbaala nchara. Nchara a ga-abụkwa ama megide unu, ọ ga-erepịa anụ ahụ unu dịka ọkụ. Unu akpakọtala akụ nʼụbọchị ikpeazụ ndị a.

4Geenụ ntị! Ụzụ akwa ndị ọrụ unu, ndị unu jụrụ ịkwụ ụgwọ ọrụ ha dị ka o kwesiri na-agbago imegide unu. Ụzụ akwa ndị ọrụ unu, ndị unu ghọgburu, eruola ntị Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.