Jemis 5

Ọlaọcha na ọlaedo unu agbaala nchara. Nchara a ga-abụkwa ama megide unu, ọ ga-erepịa anụ ahụ unu dịka ọkụ. Unu akpakọtala akụ nʼụbọchị ikpeazụ ndị a.

James 5:3 (UKJV) Your gold and silver is cankered; and the rust of them shall be a witness against you, and shall eat your flesh as it were fire. All of you have heaped treasure together for the last days.

1Ugbu a geenụ ntị unu ndị ọgaranya, oge eruola mgbe unu kwesiri ịkwa akwa na ịsụ ude nʼihi nsogbu na-akwado ịbịakwasị unu.

2Akụnụba unu ebidola ịta nchara, mkpu eripịakwala uwe unu.

3Ọlaọcha na ọlaedo unu agbaala nchara. Nchara a ga-abụkwa ama megide unu, ọ ga-erepịa anụ ahụ unu dịka ọkụ. Unu akpakọtala akụ nʼụbọchị ikpeazụ ndị a.

4Geenụ ntị! Ụzụ akwa ndị ọrụ unu, ndị unu jụrụ ịkwụ ụgwọ ọrụ ha dị ka o kwesiri na-agbago imegide unu. Ụzụ akwa ndị ọrụ unu, ndị unu ghọgburu, eruola ntị Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.

5Unu ebiela ndụ nke oke oriri na oke ọṅụṅụ nʼelu ụwa, na ndụ inye anụ ahụ unu ihe ọbụla na-akpa ya mkpa. Ma ugbu a, anụ ahụ unu ahụ gbara abụba ejikerela na-eche ụbọchị mgburi ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.