6Asịrị m, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. Lee, amaghị m ekwu okwu. Abụ m naanị nwantakịrị.”
7Ma Onyenwe anyị sịrị m, “Asịkwala ‘Abụ m naanị nwantakịrị,’ nʼihi na ị ga-agakwuru onye ọbụla m zigara gị, ị ga-ekwukwa ihe niile m nyere gị nʼiwu.
8Atụkwala egwu nʼihi ha, nʼihi na mụ onwe nọnyere gị ịnapụta gị,” ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwupụtara.
9Mgbe ahụ, Onyenwe anyị setịpụrụ aka ya metụ m nʼọnụ, sị m, “Lee, ewerela m okwu m tinye gị nʼọnụ.
10Lee, taa, ana m eme gị onye nlekọta mba dị iche iche na alaeze niile, ihopu na ikwada, ịla nʼiyi na ịtịkpọkwa ha, i wulite ma kụọkwa.”