8Atụkwala egwu nʼihi ha, nʼihi na mụ onwe nọnyere gị ịnapụta gị,” ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwupụtara.
9Mgbe ahụ, Onyenwe anyị setịpụrụ aka ya metụ m nʼọnụ, sị m, “Lee, ewerela m okwu m tinye gị nʼọnụ.
10Lee, taa, ana m eme gị onye nlekọta mba dị iche iche na alaeze niile, ihopu na ikwada, ịla nʼiyi na ịtịkpọkwa ha, i wulite ma kụọkwa.”
11Mgbe ahụ, okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m, na-asị, “Jeremaya, gịnị ka ị na-ahụ?” Azara m sị, “Ana m ahụ otu alaka osisi alụmọnd.”
12Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Ị hụrụ nke ọma, nʼihi na m na-eche okwu ọnụ ịhụ m na m mezuru ha.”