10Lee, taa, ana m eme gị onye nlekọta mba dị iche iche na alaeze niile, ihopu na ikwada, ịla nʼiyi na ịtịkpọkwa ha, i wulite ma kụọkwa.”
11Mgbe ahụ, okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m, na-asị, “Jeremaya, gịnị ka ị na-ahụ?” Azara m sị, “Ana m ahụ otu alaka osisi alụmọnd.”
12Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Ị hụrụ nke ọma, nʼihi na m na-eche okwu ọnụ ịhụ m na m mezuru ha.”
13Okwu Onyenwe anyị bịakwutere m nke ugboro abụọ na-asị, “Gịnị ka ị na-ahụ?” A sịrị m, “Ana m ahụ ite mmiri ọkụ, nke na-agbọ agbọ, nke e mere ka o hulata chee ọnụ ya na ndịda.”
14Onyenwe anyị sịrị m, “Ihe egwu ga-esite nʼugwu bịakwasị ndị niile bi nʼala a.