Jeremaya 10

Nʼihi na ndị ọzụzụ atụrụ a enweghị uche. Ha adịghị ajụta ase site nʼaka Onyenwe anyị, ya mere, na ihe adịghị agara ha nke ọma, igwe atụrụ ha niile agbasasịakwala.

Jeremiah 10:21 (UKJV) For the pastors are become brutish, and have not sought the LORD: therefore they shall not prosper, and all their flocks shall be scattered.

19Ahụhụ dịịrị m nʼihi mmerụ ahụ m merụrụ. Ọnya dị m nʼahụ enweghị ọgwụgwọ. Ma ana m akasị onwe m obi na-asị, “Nʼezie, ọrịa a dakwasịrị m bụ ọrịa m, aga m edikwa ya.”

20Ebibiela ụlọ ikwu m, e tibisiala ụdọ ya niile. Ụmụ m ndị ikom esitela nʼebe m nọ pụọ, ha anọkwaghị ya. Ọ dịkwaghị onye fọdụrụ nke ga-enyere m aka isetipụ ụlọ ikwu m, maọbụ onye ga-edoziri m ebe m ga-anọ zuo ike.

21Nʼihi na ndị ọzụzụ atụrụ a enweghị uche. Ha adịghị ajụta ase site nʼaka Onyenwe anyị, ya mere, na ihe adịghị agara ha nke ọma, igwe atụrụ ha niile agbasasịakwala.

22Gee ntị, nụrụ! Lee ozi na-abịa, oke ụzụ nke ọgbaaghara site nʼala dị nʼugwu, ime ka obodo niile nke Juda tọgbọrọ nʼefu, ghọọkwa ebe obibi nye nkịta ọhịa.

23O Onyenwe anyị, amaara m na ụzọ mmadụ adịghị nʼaka ya, na ọ bụghị mmadụ ka ọ dịịrị ịtụziri onwe ya ụzọ nke ọ ga-agbaso.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.