Jeremaya 10

O Onyenwe anyị, amaara m na ụzọ mmadụ adịghị nʼaka ya, na ọ bụghị mmadụ ka ọ dịịrị ịtụziri onwe ya ụzọ nke ọ ga-agbaso.

Jeremiah 10:23 (UKJV) O LORD, I know that the way of man is not in himself: it is not in man that walks to direct his steps.

21Nʼihi na ndị ọzụzụ atụrụ a enweghị uche. Ha adịghị ajụta ase site nʼaka Onyenwe anyị, ya mere, na ihe adịghị agara ha nke ọma, igwe atụrụ ha niile agbasasịakwala.

22Gee ntị, nụrụ! Lee ozi na-abịa, oke ụzụ nke ọgbaaghara site nʼala dị nʼugwu, ime ka obodo niile nke Juda tọgbọrọ nʼefu, ghọọkwa ebe obibi nye nkịta ọhịa.

23O Onyenwe anyị, amaara m na ụzọ mmadụ adịghị nʼaka ya, na ọ bụghị mmadụ ka ọ dịịrị ịtụziri onwe ya ụzọ nke ọ ga-agbaso.

24Ya mere, Onyenwe anyị, site nʼụzọ nke ikpe ziri ezi dọọ m aka na ntị, ma ọ bụghị site nʼiwe gị, ma ọ bụghị ya, ị ga-eme ka m ghọọ ihe efu.

25Wụkwasị ọnụma gị nʼelu mba niile dị iche iche bụ ndị na-amaghị gị, wụkwasịkwa ya ndị ahụ niile na-adịghị akpọku aha gị. Nʼihi na ha eripịala Jekọb, ha eripịala ya kpamkpam, bibiekwa ebe obibi ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.