Jeremaya 12

Ọtụtụ ndị ọzụzụ atụrụ ebibiela ubi vaịnị m. Ha azọtọọla ubi m nʼokpuru ụkwụ, ha emeela ka ubi m mara mma ghọọ ọzara tọgbọrọ nʼefu.

Jeremiah 12:10 (UKJV) Many pastors have destroyed my vineyard, they have trodden my portion under foot, they have made my pleasant portion a desolate wilderness.

8Ihe nketa m aghọrọọla m, ihe dịka ọdụm nọ nʼọhịa, Ọ na-agbọ ụja megide m; ya mere, m ji kpọọ ya asị.

9Ọ bụ na ihe nketa m aghọbeghị nnụnụ ugo tụrụ agwa nye m nke ọtụtụ ugo gbara gburugburu na-emegide ya? Gaanụ, kpọkọta ụmụ anụ ọhịa niile, mee ka ha zukọọ bịa dọrie nri.

10Ọtụtụ ndị ọzụzụ atụrụ ebibiela ubi vaịnị m. Ha azọtọọla ubi m nʼokpuru ụkwụ, ha emeela ka ubi m mara mma ghọọ ọzara tọgbọrọ nʼefu.

11Ha emeela ya ka ọ ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu; e, ọ ghọọla ebe kpọrọ nkụ nʼebe tọgbọrọ nʼefu nʼihu m. Ala ahụ niile ga-atọgbọrọkwa nʼefu, nʼihi na o nweghị onye ọbụla ihe banyere ya na-emetụ nʼobi.

12Ndị mbibi ga-ejupụta nʼelu ebe niile dị elu nke ọzara, nʼihi na mma agha Onyenwe anyị ga-esite nʼotu nsọtụ ala ahụ ruo na nsọtụ nke ọzọ, ripịa ndị niile dị na ya. O nweghị onye ọbụla udo ga-adịrị nʼala ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.