Jeremaya 12

Ọ bụ na ihe nketa m aghọbeghị nnụnụ ugo tụrụ agwa nye m nke ọtụtụ ugo gbara gburugburu na-emegide ya? Gaanụ, kpọkọta ụmụ anụ ọhịa niile, mee ka ha zukọọ bịa dọrie nri.

Jeremiah 12:9 (UKJV) Mine heritage is unto me as a speckled bird, the birds round about are against her; come all of you, assemble all the beasts of the field, come to devour.

7“Aga m agbakụta ụlọ m na ihe nketa m họpụtara nye onwe m azụ. Aga m ewere onye ahụ m hụrụ nʼanya nyefee ya nʼaka onye iro ya.

8Ihe nketa m aghọrọọla m, ihe dịka ọdụm nọ nʼọhịa, Ọ na-agbọ ụja megide m; ya mere, m ji kpọọ ya asị.

9Ọ bụ na ihe nketa m aghọbeghị nnụnụ ugo tụrụ agwa nye m nke ọtụtụ ugo gbara gburugburu na-emegide ya? Gaanụ, kpọkọta ụmụ anụ ọhịa niile, mee ka ha zukọọ bịa dọrie nri.

10Ọtụtụ ndị ọzụzụ atụrụ ebibiela ubi vaịnị m. Ha azọtọọla ubi m nʼokpuru ụkwụ, ha emeela ka ubi m mara mma ghọọ ọzara tọgbọrọ nʼefu.

11Ha emeela ya ka ọ ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu; e, ọ ghọọla ebe kpọrọ nkụ nʼebe tọgbọrọ nʼefu nʼihu m. Ala ahụ niile ga-atọgbọrọkwa nʼefu, nʼihi na o nweghị onye ọbụla ihe banyere ya na-emetụ nʼobi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.