5“Ọ bụrụ na ndị ji ụkwụ ha agba ọsọ emerie gị nʼọsọ nke gị na ha gbara, i si aṅaa chee na gị na ndị ji ịnyịnya agba ọsọ nwere ike ịgbakọta ọsọ ịsọ mpi? Ọ bụrụ na ị sọọ ngọngọ nʼala ebe udo dị, ị ga-esi aṅaa ghara ịsọ ngọngọ nʼọhịa dị nʼakụkụ osimiri Jọdan?
6Lee, ọ bụladị ụmụnne gị, ndị ezinaụlọ nke aka gị, ararala gị nye. Lee, ha eweliela oke olu iti mkpu megide gị. Atụkwasịla ha obi, ọ bụladị mgbe ha na-ekwu okwu ọma banyere gị.
7“Aga m agbakụta ụlọ m na ihe nketa m họpụtara nye onwe m azụ. Aga m ewere onye ahụ m hụrụ nʼanya nyefee ya nʼaka onye iro ya.
8Ihe nketa m aghọrọọla m, ihe dịka ọdụm nọ nʼọhịa, Ọ na-agbọ ụja megide m; ya mere, m ji kpọọ ya asị.
9Ọ bụ na ihe nketa m aghọbeghị nnụnụ ugo tụrụ agwa nye m nke ọtụtụ ugo gbara gburugburu na-emegide ya? Gaanụ, kpọkọta ụmụ anụ ọhịa niile, mee ka ha zukọọ bịa dọrie nri.