Jeremaya 12

Ị kụọla ha ka osisi, ha agbaala mgbọrọgwụ; ha na-etokwa na-amị mkpụrụ. Ị nọ nso mgbe niile nʼọnụ ha, ma ị nọ nʼebe dị anya nʼobi ha.

Jeremiah 12:2 (UKJV) You have planted them, yea, they have taken root: they grow, yea, they bring forth fruit: you are near in their mouth, and far from their reins.

1Onye ezi omume ka ị bụ mgbe niile, gị Onyenwe anyị, mgbe ọbụla m butere ikpe bịa nʼihu gị. Ma achọrọ m ịgwa gị okwu banyere ikpe ziri ezi gị: Gịnị mere ihe ji agara ndị ajọ omume nke ọma? Gịnị mere ndị na-aghọ aghụghọ ji ebi ndụ enweghị nsogbu ọbụla?

2Ị kụọla ha ka osisi, ha agbaala mgbọrọgwụ; ha na-etokwa na-amị mkpụrụ. Ị nọ nso mgbe niile nʼọnụ ha, ma ị nọ nʼebe dị anya nʼobi ha.

3Ma gị onwe gị maara m Onyenwe anyị; ị na-ahụ m, na-anwapụtakwa echiche niile m na-eche banyere gị. Dọkpụrụ ha dịka atụrụ a ga-egbu egbu. Doo ha iche nye ụbọchị ahụ a ga-egbu ha.

4Ruo ole mgbe ka ala ga-eru ụjụ? Ruo ole mgbe ka ahịhịa dị nʼubi ga-anọgide na-akpọnwụ? Ụmụ anụmanụ na nnụnụ na-anwụchasị nʼihi na ndị bi nʼala ahụ bụ ndị na-emebi iwu. Ma ndị mmadụ ahụ na-ekwu sị, “Ọ gaghị ahụ ihe ga-adakwasị anyị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.