14Aga m atụpịakwa ha, otu onye nʼelu ibe ya, nna na ụmụ ya nʼelu ibe ha kwa. Agaghị m ekwe ka obi ọmịiko, maọbụ obi ebere gbochie m ibibi ha.’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
15Nụrụnụ, geekwanụ ntị, unu ebulila onwe unu elu, nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola ya.
16Nyenụ Onyenwe anyị Chineke unu nsọpụrụ. Tupu o mee ka ọchịchịrị dakwasị unu; tupu unu akpọbie ụkwụ unu nʼelu ugwu gbara ọchịchịrị. Unu na-ele anya ìhè ma ọ ga-eme ka ihe ahụ ghọọrọ unu oke ọchịchịrị. Ọ ga-agbanwe ihe ahụ, mee ka ọ ghọọ onyinyo ọnwụ.
17Ma ọ bụrụ na unu ajụ ige ntị. Ọ bụ na nzuzo ka m ga-anọ kwaa akwa nʼihi mpako unu. Anya mmiri ga-esi m nʼanya pụta; anya mmiri ga-esi na ya na-eruda nke ukwuu nʼihi na igwe atụrụ Onyenwe anyị ka a ga-adọta nʼagha.
18Gwanụ eze na nne eze okwu sị ha, “Sitenụ nʼocheeze unu rịdata, nʼihi na okpueze ọma unu ga-esi nʼisi unu dapụ.”