16A ga-esitekwa nʼụlọ tụpụ ndị ahụ niile ha na-eburu amụma nʼokporoụzọ Jerusalem nʼihi ụnwụ na mma agha. O nweghị onye ga-eli ha, maọbụ ndị nwunye ha, maọbụ ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom. Nʼihi na aga m awụkwasị ha ihe ọjọọ ahụ niile ruuru ha.
17“Gwa ha okwu ndị a, “ ‘Ka anya mmiri si nʼanya m na-eruda ehihie na abalị, na-akwụsịghị akwụsị, nʼihi ndị m, nʼihi ada ndị m, nke na-amaghị nwoke, ndị hụrụla ahụhụ dị ukwuu, ndị e tipụtara ọnya jọrọ njọ.
18Ọ bụrụ na m apụọ jee nʼime ime obodo ana m ahụ ndị e ji mma agha gbuo; Ọ bụrụ na m abata nʼobodo ukwu, ana m ahụ mbibi nke ụnwụ wetara. Ma onye amụma ma onye nchụaja agaala nʼala nke ha amaghị.’ ”
19Ị jụla Juda kpamkpam? Ọ pụtara na ihe banyere Zayọn adịghị atọkwa gị ụtọ? Gịnị mere i ji tigbuo anyị ruo na ọgwụgwọ adịghịkwa nye anyị? Anyị lere anya udo, ma ọ dịghị ezi ihe bịara; anyị lere anya ọgwụgwọ, ma lee, ihe anyị hụrụ bụ oke egwu.
20Onyenwe anyị, anyị nabatara ajọ omume anyị, na ikpe mara nna nna anyị ha; nʼezie, anyị onwe anyị emehiekwala megide gị.