Jeremaya 14

Onyenwe anyị, anyị nabatara ajọ omume anyị, na ikpe mara nna nna anyị ha; nʼezie, anyị onwe anyị emehiekwala megide gị.

Jeremiah 14:20 (UKJV) We acknowledge, O LORD, our wickedness, and the iniquity of our fathers: for we have sinned against you.

18Ọ bụrụ na m apụọ jee nʼime ime obodo ana m ahụ ndị e ji mma agha gbuo; Ọ bụrụ na m abata nʼobodo ukwu, ana m ahụ mbibi nke ụnwụ wetara. Ma onye amụma ma onye nchụaja agaala nʼala nke ha amaghị.’ ”

19Ị jụla Juda kpamkpam? Ọ pụtara na ihe banyere Zayọn adịghị atọkwa gị ụtọ? Gịnị mere i ji tigbuo anyị ruo na ọgwụgwọ adịghịkwa nye anyị? Anyị lere anya udo, ma ọ dịghị ezi ihe bịara; anyị lere anya ọgwụgwọ, ma lee, ihe anyị hụrụ bụ oke egwu.

20Onyenwe anyị, anyị nabatara ajọ omume anyị, na ikpe mara nna nna anyị ha; nʼezie, anyị onwe anyị emehiekwala megide gị.

21Elelịla anyị anya, nʼihi aha gị. Ekwela ka ocheeze gị dị ebube bụrụ ihe a na-adịghị asọpụrụ. Cheta ọgbụgba ndụ nke anyị na gị gbara; emebikwala ya.

22Ọ dị chi ihe efu nke ndị mba ọzọ nwere ike ime ka mmiri zoo? Mbara eluigwe ọ pụrụ ime ka mmiri zoo site nʼike aka ya naanị? Mba! Ọ bụ gị, Onyenwe anyị Chineke anyị pụrụ ime ihe ndị a. Nʼihi nke a, olileanya anyị dị nʼime gị, nʼihi na ọ bụ gị na-eme ihe ndị a niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.