2“Juda na-eru ụjụ, ndị bi nʼobodo ya niile na-ahụjukwa anya. Ha na-akwa akwa nʼihi ala ahụ, ụda ịkwa akwa ha eruokwala Jerusalem.
3Ndị a na-asọpụrụ na-ezipụ ndị ohu ha ịga chọta mmiri. Ha na-aga nʼolulu mmiri ma o nweghị mmiri ha na-achọta. Ha bu ite nke mmiri ọbụla na-adịghị nʼime ya na-alọta. Ha ji aka ha kpuchie isi ha nʼihi ịda mba nke obi na nʼihi ọnọdụ obi ọjọọ nke ha nọ nʼime ya.
4Ala na-agbawa nʼihi enweghị mmiri ozuzo. Ndị ọrụ ubi na-ekpuchikwa isi ha nʼihi obi ọjọọ ha.
5Ọ bụladị nne ele, nke nọ nʼọhịa, na-ahapụ nwa ọhụrụ ya, nʼihi na ahịhịa ndụ adịghị.
6Ịnyịnya ibu ọhịa na-eguzokwa nʼelu ebe dị elu nke ahịhịa na-adịghị. Ha na-eku ume na-ekupụ ngwangwa, ngwangwa, dịka nkịta ọhịa; anya ha adabamiela ha nʼisi nʼihi ahụghị ahịhịa ndụ ha ga-ata.”