9Nwanyị mụrụ ụmụ asaa ga-ada mba, kubie ume. Ọ ga-anwụ mgbe oge ya na-erubeghị, ihere ga-eme ya; ọ ga-abụkwa onye e wedara nʼala. Ma ndị fọdụrụ ndụ ka m ga-eme ka ha nwụọ site na mma agha ndị iro ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
10Ahụhụ dịịrị m, nne m, na ị mụrụ m, onye ya na ndị niile bi nʼala a na-alụ ọgụ, ma na-ese okwu. O nwebeghị onye m binyere ego, ọ dịkwaghị onye binyere m ego, ma mmadụ niile na-akọcha m.
11Onyenwe anyị kwuru sị, “Nʼezie, aga m anapụta gị nʼihi ezi ihe, aga m eme ka onye iro gị rịọ gị arịrịọ nʼoge ihe ọjọọ na nʼoge mkpagbu.
12“Mmadụ o nwere ike ịgbaji igwe, ya bụ igwe e si nʼakụkụ ugwu bubata, maọbụ bronz?
13“Aga m ewere ihe niile i nwere, ya na akụnụba gị, nye ya onye ga-akwata ha nʼagha. Ọ gaghị akwụ gị ihe ọbụla. Nʼihi na mmehie gị niile ejupụtala nʼala a niile.