17O nwebeghị oge mụ na ndị na-achị ọchị nke ukwuu ji nọkọọ. Esokwaghị m ha ṅụrịkọọ ọṅụ. A nọdụụrụ m onwe m nʼihi na aka gị dịkwasịrị m. I mekwara ka iwe jupụta m nʼobi nʼihi ajọ omume ha.
18Gịnị mere ihe mgbu m adịghị akwụsị akwụsị? Gịnị mekwara ọnya m ji dị njọ na-apụghị ịgwọta ya? Ị dịrị m dịka mmiri iyi na-arafu mmadụ, dịka isi iyi nke na-ekwesighị ntụkwasị obi.
19Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ọ bụrụ na i chegharịa, aga m etinyeghachi gị nʼọnọdụ gị, ime ka i guzokwa nʼihu m. Ọ bụrụ na okwu si gị nʼọnụ abụrụ okwu kwesiri ntụkwasị obi, okwu na-abụghị okwu nzuzu ị ga-abụ onye na-ekwuchitere m ọnụ m. Ndị a ga-alaghachikwute gị ma i gaghị alaghachikwuru ha.
20Aga m eme ka ị dịrị ka mgbidi nʼebe ha nọ. Ị ga-abụ mgbidi e wusiri ike, nke e ji bronz wuo. Ha ga-ebuso gị agha, ma ha agaghị emeri gị nʼihi na m nọnyeere gị ịnapụta gị, nakwa ịzọpụta gị,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
21“Aga m anapụta gị site nʼaka ndị ọjọọ. Gbapụtakwa gị site nʼaka ndị na-enweghị obi ebere.”