3“Aga m ezite ụdị mbibi anọ megide ha: mma agha nke ga-egbu ha, nkịta ga-adọkpụrụ ozu ha pụọ, ụmụ anụ ufe na ụmụ anụ ọhịa dị iche iche ga-eripịa ha, ma bibiekwa ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
4Aga m eme ka ha ghọọ ihe a na-asọ oyi nʼalaeze niile nke ụwa, nʼihi ihe Manase nwa eze Hezekaya nke Juda mere na Jerusalem.
5“Onye ga-enwe ebere nʼahụ gị, gị Jerusalem? Onye ga-eru ụjụ nʼihi ihe ga-adakwasị gị? Onye ga-apụta guzo ịjụ ajụjụ banyere otu ihe si agara gị?
6Gị onwe gị ajụla m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ị nọgidela na-adaghachi azụ. Ya mere, aga m ebikwasị gị aka, bibie gị. Ike m ji akwụsị gị ka ị ghara ịdaghachi azụ agwụla m.
7Aga m eji ihe e ji afụcha ọka fụchaa ha nʼọnụ ụzọ ama nke ala ahụ. Aga m eme ka mbibi bịakwasị ndị m, nke ga-eme ka ha gbara aka ụmụ, nʼihi na ha esitebeghị nʼụzọ ọjọọ ha chigharịa.