2Ọ bụrụ na ha ajụọ gị si, ‘Ebee ka anyị ga-aga?’ Gwa ha na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “ ‘Ndị e debere nʼihi ọnwụ ga-anwụ, ndị e debere nʼihi mma agha ka mma agha ga-egbu; ndị e debere nʼihi ụnwụ ka ụnwụ ga-egbu, otu a kwa, ndị e debere nʼihi ịdọta nʼagha, ka a ga-adọta nʼagha buru ha gaa mba ọzọ.’
3“Aga m ezite ụdị mbibi anọ megide ha: mma agha nke ga-egbu ha, nkịta ga-adọkpụrụ ozu ha pụọ, ụmụ anụ ufe na ụmụ anụ ọhịa dị iche iche ga-eripịa ha, ma bibiekwa ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
4Aga m eme ka ha ghọọ ihe a na-asọ oyi nʼalaeze niile nke ụwa, nʼihi ihe Manase nwa eze Hezekaya nke Juda mere na Jerusalem.
5“Onye ga-enwe ebere nʼahụ gị, gị Jerusalem? Onye ga-eru ụjụ nʼihi ihe ga-adakwasị gị? Onye ga-apụta guzo ịjụ ajụjụ banyere otu ihe si agara gị?
6Gị onwe gị ajụla m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ị nọgidela na-adaghachi azụ. Ya mere, aga m ebikwasị gị aka, bibie gị. Ike m ji akwụsị gị ka ị ghara ịdaghachi azụ agwụla m.