6Gị onwe gị ajụla m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ị nọgidela na-adaghachi azụ. Ya mere, aga m ebikwasị gị aka, bibie gị. Ike m ji akwụsị gị ka ị ghara ịdaghachi azụ agwụla m.
7Aga m eji ihe e ji afụcha ọka fụchaa ha nʼọnụ ụzọ ama nke ala ahụ. Aga m eme ka mbibi bịakwasị ndị m, nke ga-eme ka ha gbara aka ụmụ, nʼihi na ha esitebeghị nʼụzọ ọjọọ ha chigharịa.
8Aga m eme ka ọnụọgụgụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ baa ụba. Ha ga-ehi nne karịa aja dị nʼọnụ oke osimiri. Nʼetiti ehihie ka m ga-eme ka onye mbibi bịakwasị ndị bụ nne ụmụ okorobịa ha; na mberede ka m ga-eme ka nhụju anya na ihe oke egwu bịakwasị ha.
9Nwanyị mụrụ ụmụ asaa ga-ada mba, kubie ume. Ọ ga-anwụ mgbe oge ya na-erubeghị, ihere ga-eme ya; ọ ga-abụkwa onye e wedara nʼala. Ma ndị fọdụrụ ndụ ka m ga-eme ka ha nwụọ site na mma agha ndị iro ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
10Ahụhụ dịịrị m, nne m, na ị mụrụ m, onye ya na ndị niile bi nʼala a na-alụ ọgụ, ma na-ese okwu. O nwebeghị onye m binyere ego, ọ dịkwaghị onye binyere m ego, ma mmadụ niile na-akọcha m.