Jeremaya 17

Ihe a ka Onyenwe anyị gwara m, “Gaa, guzo nʼọnụ ụzọ ama obodo, ebe ndị eze Juda na-esi apụ, ma na-abatakwa. Guzokwa nʼọnụ ụzọ ama ndị ọzọ niile dị na Jerusalem.

Jeremiah 17:19 (UKJV) Thus said the LORD unto me; Go and stand in the gate of the children of the people, whereby the kings of Judah come in, and by the which they go out, and in all the gates of Jerusalem;

17A ghọrọla m ihe na-eyi egwu, nʼihi na ị bụ ebe mgbaba m nʼụbọchị mbibi.

18Mee ka ihere mee ndị na-akpagbu m. Ekwekwala ka ihere mee m. Mee ka ha tụọ ụjọ, ma chebe m site nʼihe egwu. Mee ka ụbọchị mbibi bịakwasị ha, werekwa okpukpu ihe mbibi abụọ tipịa ha.

19Ihe a ka Onyenwe anyị gwara m, “Gaa, guzo nʼọnụ ụzọ ama obodo, ebe ndị eze Juda na-esi apụ, ma na-abatakwa. Guzokwa nʼọnụ ụzọ ama ndị ọzọ niile dị na Jerusalem.

20Gwa ha sị, ‘Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị eze Juda na ndị Juda niile, na ndị niile bi na Jerusalem, ndị na-esi nʼọnụ ụzọ a apụ, na-abatakwa.’

21Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Lezienụ onwe unu anya ịhụ na unu ebughị ibu ọbụla nʼụbọchị izuike; lezienụ onwe unu anya ịhụ na unu esiteghị nʼọnụ ụzọ ama Jerusalem bufee ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.