Jeremaya 17

Ma ọ bụrụ na unu enupu isi jụ idebe ụbọchị izuike nsọ, ọ bụrụ na unu anọgide na-ebubata ihe site nʼọnụ ụzọ ama Jerusalem nʼụbọchị izuike, aga m amụnye ọnụ ụzọ ama niile dị na Jerusalem ọkụ, nke a na-apụghị imenyụ emenyụ. Ọ ga-erepịakwa ebe niile e wusiri ike na Jerusalem.’ ”

Jeremiah 17:27 (UKJV) But if all of you will not hearken unto me to hallow the sabbath day, and not to bear a burden, even entering in at the gates of Jerusalem on the sabbath day; then will I kindle a fire in the gates thereof, and it shall devour the palaces of Jerusalem, and it shall not be quenched.

25mgbe ahụ, ndị eze ndị ga-anọkwasị nʼocheeze Devid ga-edu ndị na-ejere ya ozi na-agafe na-abatakwa site nʼọnụ ụzọ ama a. Ha na ndị na-ejere ha ozi ga-anọkwasị nʼịnyịnya ha, na nʼụgbọ agha ha, mgbe ha sị nʼọnụ ụzọ ama a na-abata, ma na-apụ. Ndị Juda, na ndị bi na Jerusalem ga-esokwa ha nʼazụ. Aga m emekwa ka ndị mmadụ biri nʼobodo a ruo mgbe ebighị ebi.

26Ndị mmadụ ga-esite nʼobodo niile nke Juda, na nʼobodo nta gbara Jerusalem gburugburu; ha ga-esitekwa nʼala ndị Benjamin, na nʼala ndagwurugwu nke ugwu ndị ahụ dị nʼọdịda anyanwụ, sitekwa nʼala Negev, na-ewebata onyinye aja nsure ọkụ, na aja dị iche iche, na onyinye ọka, na onyinye ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na onyinye ekele, nʼime ụlọ Onyenwe anyị.

27Ma ọ bụrụ na unu enupu isi jụ idebe ụbọchị izuike nsọ, ọ bụrụ na unu anọgide na-ebubata ihe site nʼọnụ ụzọ ama Jerusalem nʼụbọchị izuike, aga m amụnye ọnụ ụzọ ama niile dị na Jerusalem ọkụ, nke a na-apụghị imenyụ emenyụ. Ọ ga-erepịakwa ebe niile e wusiri ike na Jerusalem.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.