Jeremaya 17

mgbe ahụ, ndị eze ndị ga-anọkwasị nʼocheeze Devid ga-edu ndị na-ejere ya ozi na-agafe na-abatakwa site nʼọnụ ụzọ ama a. Ha na ndị na-ejere ha ozi ga-anọkwasị nʼịnyịnya ha, na nʼụgbọ agha ha, mgbe ha sị nʼọnụ ụzọ ama a na-abata, ma na-apụ. Ndị Juda, na ndị bi na Jerusalem ga-esokwa ha nʼazụ. Aga m emekwa ka ndị mmadụ biri nʼobodo a ruo mgbe ebighị ebi.

Jeremiah 17:25 (UKJV) Then shall there enter into the gates of this city kings and princes sitting upon the throne of David, riding in chariots and on horses, they, and their princes, the men of Judah, and the inhabitants of Jerusalem: and this city shall remain for ever.

23Ma ha egeghị ntị, maọbụ kpọọ ya mkpa ha. Ha bụ ndị ntị ike, ndị na-adịghị aṅa ntị nʼịdọ aka na ntị, maọbụ nabata ya.

24Ma otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, ọ bụrụ na unu ga-elezi anya rubere m isi, hapụ isi nʼọnụ ụzọ ama obodo a bufee maọbụ bubata ibu nʼụbọchị izuike, kama debe ụbọchị izuike nsọ, site na-arụghị ọrụ ọbụla nʼime ya,

25mgbe ahụ, ndị eze ndị ga-anọkwasị nʼocheeze Devid ga-edu ndị na-ejere ya ozi na-agafe na-abatakwa site nʼọnụ ụzọ ama a. Ha na ndị na-ejere ha ozi ga-anọkwasị nʼịnyịnya ha, na nʼụgbọ agha ha, mgbe ha sị nʼọnụ ụzọ ama a na-abata, ma na-apụ. Ndị Juda, na ndị bi na Jerusalem ga-esokwa ha nʼazụ. Aga m emekwa ka ndị mmadụ biri nʼobodo a ruo mgbe ebighị ebi.

26Ndị mmadụ ga-esite nʼobodo niile nke Juda, na nʼobodo nta gbara Jerusalem gburugburu; ha ga-esitekwa nʼala ndị Benjamin, na nʼala ndagwurugwu nke ugwu ndị ahụ dị nʼọdịda anyanwụ, sitekwa nʼala Negev, na-ewebata onyinye aja nsure ọkụ, na aja dị iche iche, na onyinye ọka, na onyinye ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na onyinye ekele, nʼime ụlọ Onyenwe anyị.

27Ma ọ bụrụ na unu enupu isi jụ idebe ụbọchị izuike nsọ, ọ bụrụ na unu anọgide na-ebubata ihe site nʼọnụ ụzọ ama Jerusalem nʼụbọchị izuike, aga m amụnye ọnụ ụzọ ama niile dị na Jerusalem ọkụ, nke a na-apụghị imenyụ emenyụ. Ọ ga-erepịakwa ebe niile e wusiri ike na Jerusalem.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.