Jeremaya 17

Ma ha egeghị ntị, maọbụ kpọọ ya mkpa ha. Ha bụ ndị ntị ike, ndị na-adịghị aṅa ntị nʼịdọ aka na ntị, maọbụ nabata ya.

Jeremiah 17:23 (UKJV) But they obeyed not, neither inclined their ear, but made their neck stiff, that they might not hear, nor receive instruction.

21Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Lezienụ onwe unu anya ịhụ na unu ebughị ibu ọbụla nʼụbọchị izuike; lezienụ onwe unu anya ịhụ na unu esiteghị nʼọnụ ụzọ ama Jerusalem bufee ya.

22Unu esitela nʼụlọ unu buputa ihe ọbụla, unu arụkwala ọrụ ọbụla nʼụbọchị izuike. Doonụ ụbọchị izuike nsọ dịka m nyere nna unu ha nʼiwu.

23Ma ha egeghị ntị, maọbụ kpọọ ya mkpa ha. Ha bụ ndị ntị ike, ndị na-adịghị aṅa ntị nʼịdọ aka na ntị, maọbụ nabata ya.

24Ma otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, ọ bụrụ na unu ga-elezi anya rubere m isi, hapụ isi nʼọnụ ụzọ ama obodo a bufee maọbụ bubata ibu nʼụbọchị izuike, kama debe ụbọchị izuike nsọ, site na-arụghị ọrụ ọbụla nʼime ya,

25mgbe ahụ, ndị eze ndị ga-anọkwasị nʼocheeze Devid ga-edu ndị na-ejere ya ozi na-agafe na-abatakwa site nʼọnụ ụzọ ama a. Ha na ndị na-ejere ha ozi ga-anọkwasị nʼịnyịnya ha, na nʼụgbọ agha ha, mgbe ha sị nʼọnụ ụzọ ama a na-abata, ma na-apụ. Ndị Juda, na ndị bi na Jerusalem ga-esokwa ha nʼazụ. Aga m emekwa ka ndị mmadụ biri nʼobodo a ruo mgbe ebighị ebi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.