11Gwa ha sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile sịrị: Aga m etipịa mba a na obodo a, dịka ite aja nke ọkpụ ite a si daa tipịasịa nʼụzọ a na-apụghị imezikwa ya ọzọ. Ha ga-eli ndị nwụrụ anwụ na Tofet tutu ruo mgbe ohere na-agaghị adịkwa ili ozu ọzọ.
12Ihe dị otu a ka m ga-eme nʼebe a, meekwa ndị bi na ya. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. Aga m eme obodo a ka ọ dịrị ka Tofet.
13Ụlọ niile dị na Jerusalem na ụlọ niile nke ndị eze Juda ka a ga-emerụ dịka ebe a, bụ Tofet, otu a ka a ga-esi merụọkwa ụlọ niile a suree ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ha nye usuu niile nke eluigwe, wụsakwara chi ndị ọzọ ihe ọṅụṅụ dịka onyinye.’ ”
14Mgbe Jeremaya si na Tofet, ebe ahụ Onyenwe anyị zigara ya ibu amụma lọta, o guzoro nʼogige ụlọnsọ ukwu Chineke ahụ, gwa ndị mmadụ niile okwu sị ha,
15“Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Chineke nke Izrel sịrị, ‘Geenụ ntị! Ana m aga ime ka ihe ọjọọ ahụ m kwuru okwu ya bịakwasị obodo a, na obodo nta niile gbara ya gburugburu, nʼihi na ha bụ ndị isiike, ndị jụrụ ige ntị nʼokwu m.’ ”