2jee na Ndagwurugwu nke Ben Hinom, nke dị nso nʼọnụ ụzọ ama Ejuju dị nʼọwụwa anyanwụ. Nọdụ nʼebe ahụ kwupụtara ha okwu ndị m gwara gị.
3Sị ha, ‘Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị eze Juda, na ndị Jerusalem. Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Chineke Izrel kwuru. Geenụ ntị! Aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị ala a, ụdị ihe ọjọọ ga-eme ka ntị ọbụla nụrụ ya zụọ wuruwuru.
4Nʼihi na ha ahapụla m, mee ka ebe a ghọọ nke chi ndị mba ọzọ. Ha achụọla aja nsure ọkụ nʼime ya nye chi ndị ahụ ha na nna nna ha, maọbụ ndị eze Juda, na-amaghị. Ha ejirila ọbara ndị aka ha dị ọcha mejupụta ebe a.
5Ha ewuola ebe ịchụ aja dị elu nye chi Baal. Nʼelu ya kwa ka ha na-esure ụmụ ha dịka aja nye Baal, bụ nke m na-enyeghị nʼiwu, ekwughịkwa m ya, o nwekwaghị mgbe o ji bata m nʼobi.
6Ya mere, kpacharanụ anya, nʼihi na ụbọchị ahụ na-abịa, ka Onyenwe anyị kwubiri, mgbe ndị mmadụ agaghị akpọkwa ebe a Tofet ma ọ bụkwanụ Ndagwurugwu nke Ben Hinom, kama a ga-akpọ ya Ndagwurugwu Ogbugbu.