Jeremaya 2

“Ị ga-esi aṅaa na-asị, ‘A bụghị m onye e merụrụ emerụ; o nwebeghị oge ọbụla m ji gbaso Baal?’ Leruo ụzọ gị anya na ndagwurugwu, tulee ihe ndị i mere. Ị bụ nne ịnyịnya ibu dị nkọ, na-agbagharị ebe a nʼebe nke ọzọ.

Jeremiah 2:23 (UKJV) How can you say, I am not polluted, I have not gone after Baalim? see your way in the valley, know what you have done: you are a swift dromedary traversing her ways;

21Ma mụ onwe m kụrụ gị dịka osisi vaịnị kachasị mma nke mkpụrụ ya dị ndụ dịkwa mma. Olee otu i siri tụgharịa megide m, ghọọ ihe rụrụ arụ, osisi vaịnị ọhịa?

22Nʼagbanyeghị na iji ncha sachaa onwe gị, maọbụ jirikwa ọtụtụ ntụ ncha, ntụpọ nke mmehie gị ka dị nʼihu m,” Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.

23“Ị ga-esi aṅaa na-asị, ‘A bụghị m onye e merụrụ emerụ; o nwebeghị oge ọbụla m ji gbaso Baal?’ Leruo ụzọ gị anya na ndagwurugwu, tulee ihe ndị i mere. Ị bụ nne ịnyịnya ibu dị nkọ, na-agbagharị ebe a nʼebe nke ọzọ.

24Nne ịnyịnya ibu ọhịa nke mara ụzọ ya nke ọma nʼọzara, na-esi imi ma ọ ga-esichapụta oke ịnyịnya ibu, onye pụrụ igbochi ya nʼoge mmekọ ya na oke ịnyịnya zuru? Oke ịnyịnya ọbụla chọọrọ ya agaghị atụfu oge nʼịchụgharị ya, nʼihi nʼoge ha chọrọ mmekọ, ha ga-achọta ya.

25Agbala ọsọ ruo mgbe ị ga-agbara ụkwụ efu, mgbe akpịrị ga-akpọ gị nku. Ma ị na-asị, ‘O nweghị uru ọ bara. Nʼihi na ahụrụ m chi ndị mba ọzọ nʼanya, aghaghị m ịgbaso ha.’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.