27Ha na-asị osisi, ‘Nna m ka ị bụ,’ na-asịkwa nkume, ‘Ọ bụ gị mụrụ m.’ Ha agbakụtala m azụ, jụ iche m ihu. Ma mgbe ọbụla nsogbu bịakwasịrị ha, ha na-asị, ‘Bịa, zọpụta anyị.’
28Olee ebe chi ndị ahụ i meere nye onwe gị nọ? Ka ha bịa, ma ọ bụrụ na ha nwere ike ịzọpụta gị, mgbe nsogbu bịakwasịrị unu. Nʼihi na gị, bụ Juda, nwere ọtụtụ chi dịka i si nwee ọtụtụ obodo.
29“Gịnị mere unu ji ekwu okwu ebubo megide m? Unu niile enupula isi megide m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara.
30“Nʼefu ka m tiri ụmụ unu ihe; ma nke a emeghị ka ha nabata ịdọ aka na ntị. Dịka ọdụm na-adọgbu anụ, mma agha unu eripịala ndị amụma unu.
31“Unu ndị ọgbọ a, tuleenụ okwu nke Onyenwe anyị: “O nweela mgbe m bụ ọzara nye ndị Izrel ma ọ bụkwanụ ala gbara oke ọchịchịrị? Gịnị mekwaranụ ndị m ji na-asị, ‘Anyị enwerela onwe anyị ịwagharị, anyị agaghị abịakwutekwa gị ọzọ’?