25Agbala ọsọ ruo mgbe ị ga-agbara ụkwụ efu, mgbe akpịrị ga-akpọ gị nku. Ma ị na-asị, ‘O nweghị uru ọ bara. Nʼihi na ahụrụ m chi ndị mba ọzọ nʼanya, aghaghị m ịgbaso ha.’
26“Dịka a na-eme onye ohi ihe ihere mgbe e jidere ya, otu a ka a ga-eme ụlọ Izrel ihere, ha onwe ha, ma ndị eze ha, ma ndịisi ha, ndị nchụaja ha na ndị amụma ha.
27Ha na-asị osisi, ‘Nna m ka ị bụ,’ na-asịkwa nkume, ‘Ọ bụ gị mụrụ m.’ Ha agbakụtala m azụ, jụ iche m ihu. Ma mgbe ọbụla nsogbu bịakwasịrị ha, ha na-asị, ‘Bịa, zọpụta anyị.’
28Olee ebe chi ndị ahụ i meere nye onwe gị nọ? Ka ha bịa, ma ọ bụrụ na ha nwere ike ịzọpụta gị, mgbe nsogbu bịakwasịrị unu. Nʼihi na gị, bụ Juda, nwere ọtụtụ chi dịka i si nwee ọtụtụ obodo.
29“Gịnị mere unu ji ekwu okwu ebubo megide m? Unu niile enupula isi megide m,” ka Onyenwe anyị kwupụtara.