34Nʼuwe unu ka achọtara ọbara ndị ogbenye na-enweghị ihe ọjọọ ha mere, nʼagbanyeghị na unu ejideghị ha ka ha nʼagbaka ụzọ. Ma unu gara nʼihu
35na-asịkwa, ‘Emeghị m ihe ọjọọ, ọ dịghị eweso m iwe.’ Ma aga m ekpe unu ikpe, nʼihi na unu na-asị, ‘Emeghị m mmehie.’
36Gịnị mere unu ji na-akpagharị na-agbanwe ụzọ unu ọtụtụ mgbe? Ijipt ga-etinye unu nʼọnọdụ ihere dịka ndị Asịrịa mere unu.
37Unu ga-ebu aka unu nʼisi mgbe unu si ebe ahụ na-apụ, nʼihi na Onyenwe anyị ajụla ndị ahụ unu tụkwasịrị obi. Ha agaghị enyere unu aka.