4Nʼihi na nke a ka Onyenwe anyị na-ekwu, ‘Aga m eme ka ị ghọọrọ onwe gị, ghọọkwara ndị enyi gị niile ihe egwu. Anya gị abụọ ka ị ga-eji hụ ha mgbe mma agha ndị iro ha ga-egbuda ha. Aga m ararakwa ala Juda niile nyefee ha nʼaka eze Babilọn, onye ga-egbuda ha. Aga m ararakwa ala Juda niile nyefee ha nʼaka eze Babilọn, onye ga-eburu ndị niile bi nʼime ya gaa Babilọn. Ọ ga-egbu ndị fọdụrụ.
5Aga m enyefe ndị iro ha akụ niile dị nʼobodo, na ihe niile ha rụpụtara, na ihe niile dị oke ọnụahịa, na ngwongwo na akụ niile nke ndị eze Juda. Ha ga-eburu ya dịka ihe a kwatara nʼagha laa Babilọn.
6Ma gị onwe gị bụ Pashua, na ndị niile bi nʼụlọ gị, ka a ga-adọta nʼagha buru gaa Babilọn. Nʼebe ahụ ka ị ga-anwụ. Ebe ahụ kwa ka a ga-eli gị, gị na ndị enyi gị ndị a niile ị na-eburu amụma ụgha.’ ”
7Onyenwe anyị, ị ghọọla m aghụghọ, meekwa m ka m ghọọ onye a ghọgburu nʼaghụghọ. I jidesiela m aka ike, mee ka uche gị mezuo m nʼahụ. Lee na mmadụ niile na-akparị m ụbọchị niile. Onye ọbụla jikwa m na-eme ihe ọchị.
8Nʼihi na mgbe ọbụla m meghere ọnụ kwuo okwu, aghaghị m iti mkpu. Aga m akpọ mkpu banyere ihe ike na ịla nʼiyi. Nʼihi na okwu Onyenwe anyị ewetarala m mkparị na ịkwa emo ụbọchị niile.