Jeremaya 22

Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Shalum nwa Josaya, onye nọchiri anya nna ya dịka eze Juda, bụ onye ahụ e si nʼebe a buru gaa mba ọzọ, “Ọ gaghị alọtakwa ọzọ.

Jeremiah 22:11 (UKJV) For thus says the LORD concerning Shallum the son of Josiah king of Judah, which reigned instead of Josiah his father, which went forth out of this place; He shall not return thither any more:

9Ọsịsa ha ga-enweta ga-abụ, ‘Ọ bụ nʼihi na ha gbakụtara ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke ha azụ, malite ịkpọ isiala na ife chi ndị ọzọ.’ ”

10Unu akwala akwa nʼihi eze ahụ nwụrụ anwụ, maọbụ ruo ụjụ nʼihi na ọ gaghị abụkwa eze unu, kama kwaanụ akwa nʼihi onye ahụ a dọtara nʼagha buru gaa mba ọzọ. Nʼihi na ọ gaghị alọghachi ọzọ; ọ gaghị ahụkwa ala ebe a mụrụ ya anya ọzọ.

11Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Shalum nwa Josaya, onye nọchiri anya nna ya dịka eze Juda, bụ onye ahụ e si nʼebe a buru gaa mba ọzọ, “Ọ gaghị alọtakwa ọzọ.

12Ebe ahụ e buuru ya gaa ka ọ ga-anọ nwụọ. Ọ gaghị ahụkwa ala nke aka ya anya ọzọ.”

13“Ahụhụ na-adịrị onye ahụ na-ewu ụlọeze ya site nʼụzọ ajọ omume, nke jikwa ikpe na-ezighị ezi na-ewu ime ụlọ elu ya niile, onye ahụ nke na-eme ndị mmadụ rụọ ọrụ nʼefu, nke na-adịghị akwụ ha ụgwọ ọbụla nʼihi ọrụ ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.