27Unu agaghị alọghachikwa nʼala ahụ na-agụ unu agụụ ịlọghachi nʼime ya.”
28Nwoke a bụ Jehoiakin, ọ bụ ite tiwara etiwa, nke e lelịrị elelị, ihe onye ọbụla na-achọghị? Nʼihi gịnị ka a ga-eji tufuo ya na ụmụ ya, tụga ha na mba ha na-amaghị?
29Ala, ala, ala, nụrụ okwu Onyenwe anyị.
30Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: “Detuo ya nʼakwụkwọ na nwoke a bụ onye gba aka nwa, nwoke nke ihe na-agaghị agara nke ọma nʼoge ndụ ya niile, nʼihi na o nweghị onye nʼime ụmụ ọ mụrụ nke ihe ga-agara nke ọma, o nwekwaghị onye nʼime ha ga-anọkwasị nʼocheeze Devid, maọbụ chịakwa ọzọ na Juda.”