25were gị nyefee nʼaka ndị ahụ na-achọsi ndụ gị ike, bụ ndị ahụ ị na-atụ ụjọ ha. Aga m enyefe gị nʼaka Nebukadneza eze Babilọn na ndị Kaldịa.
26Aga m atụfu gị na nne mụrụ gị, tụga unu na mba ọzọ dị iche site nʼobodo a nọ mụọ unu. Ebe ahụ ka unu ga-anọ nwụọ.
27Unu agaghị alọghachikwa nʼala ahụ na-agụ unu agụụ ịlọghachi nʼime ya.”
28Nwoke a bụ Jehoiakin, ọ bụ ite tiwara etiwa, nke e lelịrị elelị, ihe onye ọbụla na-achọghị? Nʼihi gịnị ka a ga-eji tufuo ya na ụmụ ya, tụga ha na mba ha na-amaghị?
29Ala, ala, ala, nụrụ okwu Onyenwe anyị.