23Gị onye na-ebi na Lebanọn, onye ebe obibi ya dị nʼụlọ e ji osisi sida wuo, lee ka i si na-asụ ude mgbe ihe mgbu bịakwasịrị gị, ihe mgbu yiri nke nwanyị ime na-eme.
24“Ma dịka m na-adị ndụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “a sịkwarị na gị, bụ Jehoiakin, nwa Jehoiakim eze Juda, bụ mgbaaka akara m gbanyere na mkpịsịaka dị nʼaka nri m, aga m agbapụkwa gị,
25were gị nyefee nʼaka ndị ahụ na-achọsi ndụ gị ike, bụ ndị ahụ ị na-atụ ụjọ ha. Aga m enyefe gị nʼaka Nebukadneza eze Babilọn na ndị Kaldịa.
26Aga m atụfu gị na nne mụrụ gị, tụga unu na mba ọzọ dị iche site nʼobodo a nọ mụọ unu. Ebe ahụ ka unu ga-anọ nwụọ.
27Unu agaghị alọghachikwa nʼala ahụ na-agụ unu agụụ ịlọghachi nʼime ya.”