Jeremaya 23

“Ahụrụ m ihe arụ nʼetiti ndị amụma Sameria: Ha buru amụma site nʼike chi Baal, si otu a duba ndị m, bụ Izrel na mmehie.

Jeremiah 23:13 (UKJV) And I have seen folly in the prophets of Samaria; they prophesied in Baal, and caused my people Israel to go astray.

11“Nʼihi na ndị amụma na ndị nchụaja aghọọla ndị na-amaghị Chineke. Ọ bụladị nʼime ụlọnsọ ukwu m ka m na-ahụ ajọ omume ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

12“Nʼihi ya, ụzọ ha na-agbaso ga-adị ka ebe na-amị amị; a ga-achụbanye ha nʼọchịchịrị ebe ahụ ka ha ga-anọkwa daa. Aga m eme ka ihe mbibi bịakwasị ha nʼafọ ahụ, a ga-ata ha ahụhụ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

13“Ahụrụ m ihe arụ nʼetiti ndị amụma Sameria: Ha buru amụma site nʼike chi Baal, si otu a duba ndị m, bụ Izrel na mmehie.

14Ahụkwara m ihe jọgburu onwe ya nʼetiti ndị amụma nọ na Jerusalem. Ha na-ebi ndụ ịkwa iko, na ikwu okwu ụgha. Ha na-agba ndị ajọ omume ume, si otu a na-egbochi ha isi nʼihe ọjọọ ha tụgharịa. Ha niile dịka ndị Sọdọm nʼebe m nọ; ndị Jerusalem dịkwa ka ndị Gọmọra nʼihu m.”

15Nʼihi nke a, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru banyere ndị amụma a, “Aga m eme ka ha rie nri na-akụ ilu, meekwa ka ha ṅụọ mmiri e tinyere nsi, nʼihi na mmụọ nke amaghị Chineke esitela nʼaka ndị amụma nọ na Jerusalem gbasaa ruo ndị niile bi nʼala ahụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.