Jeremaya 23

“Nʼihi na ndị amụma na ndị nchụaja aghọọla ndị na-amaghị Chineke. Ọ bụladị nʼime ụlọnsọ ukwu m ka m na-ahụ ajọ omume ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Jeremiah 23:11 (UKJV) For both prophet and priest are profane; yea, in my house have I found their wickedness, says the LORD.

9Ma banyere ndị amụma, obi m na-agbawa nʼime m, ọkpụkpụ m na-amakwa jijiji nʼihi ha. Adị m dịka nwoke mmanya na-egbu, dịka onye ṅụbigara mmanya oke, nʼihi ihe na-eche ha site nʼaka Onyenwe anyị, na site nʼokwu nsọ ya.

10Ndị jupụtara nʼala a bụ ndị na-akwa iko. Nʼihi ịbụ ọnụ ndị a niile ala a tọgbọrọ nʼefu, ahịhịa niile dị nʼọzara akpọnwụọla. Ndị amụma na-agbasokwa ihe ọjọọ. Ha na-egosikwa ike ha nʼụzọ na-ezighị ezi.

11“Nʼihi na ndị amụma na ndị nchụaja aghọọla ndị na-amaghị Chineke. Ọ bụladị nʼime ụlọnsọ ukwu m ka m na-ahụ ajọ omume ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

12“Nʼihi ya, ụzọ ha na-agbaso ga-adị ka ebe na-amị amị; a ga-achụbanye ha nʼọchịchịrị ebe ahụ ka ha ga-anọkwa daa. Aga m eme ka ihe mbibi bịakwasị ha nʼafọ ahụ, a ga-ata ha ahụhụ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.

13“Ahụrụ m ihe arụ nʼetiti ndị amụma Sameria: Ha buru amụma site nʼike chi Baal, si otu a duba ndị m, bụ Izrel na mmehie.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.