18Ma olee onye ọ bụ nʼetiti ndị amụma a nke na-abịaru Onyenwe anyị nso, hụ ya anya maọbụ ịnụ ihe ọ na-ekwu? Onye kwa nʼetiti ha nwerela ike ṅaa ntị nụrụ okwu ya?
19Lee, Onyenwe anyị na-ezite oke ifufe na-efesi ike, ọ bụ oke ifufe nke iwe ya, nke ga-abịa bufuo ndị ajọ omume a.
20Onyenwe anyị agaghị akwụsị iwe iwe ya tutu ruo mgbe o mezuru ihe niile dị ya nʼobi. Nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa nʼihu, unu ga-aghọta ihe ndị a niile nke ọma.
21Ọ bụghị m zitere ndị amụma a, ma ha na-ekwu na ọ bụ okwu si m nʼọnụ ka ha na-ekwu. O nwebeghị oge m ji gwa ha okwu, ma ha nọkwa na-ebu amụma.
22A sị na ha abịala nso guzo nʼebe ịgba izu nzuzo m, ha gaara ekwusara ndị m okwu m, nke gaara eme ka ha site nʼajọ omume ha tụgharịa, sitekwa nʼụzọ ọjọọ ha chigharịa.